18 Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.
19 Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:
20 Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.
21 Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.
22 Biko, nara iwu n'ọnu-Ya,Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.
23 Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.
24 Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá,Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;