8 Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.
9 I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.
10 N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,
11 Ma-ọbu ọchichiri, nke i nādighi-ahu anya,Na njubiga miri nēkpuchi gi.
12 Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!
13 I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?
14 Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.