1 Job we za, si,
2 Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu:Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.
3 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya!Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!
4 Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya,Meju kwa onum n'iru-uka.
5 Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim,Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
6 Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.
7 N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.