3 Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?
4 Ònye ka i gosiworo okwu?Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?
5 Ndi nādighi ndu nāma jijijiN'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.
6 Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.
7 Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu,O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.
8 Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya;Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.
9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.