7 Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu,O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.
8 Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya;Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.
9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.
10 Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri,Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.
11 Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji,Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.
12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du,Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.
13 Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma;Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.