19 O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.
20 Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.
21 Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.
22 Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.