6 Ezi omumem ka m'jideworo, m'gaghia ara kwa ya aka:Obim adighi-atam uta bayere otù n'ubọchim nile.
7 Ka onye-irom di ka onye nēmebi iwu,Ka onye nēbili imegidem di kwa ka onye ajọ omume.
8 N'ihi na gini bu olile-anya onye emeruru emeru, mb͕e Chineke nēbipu ya,Mb͕e Chineke nēsepu nkpuru-obi-ya?
9 Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya,Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
10 Ìhe nke Onye puru ime ihe nile gātọ ya utọ?Ọ̀ gākpọku Chineke na mb͕e nile?
11 M'gēzí unu ihe site n'aka Chineke;M'gaghi-ezobe ihe nke di n'aka Onye puru ime ihe nile.
12 Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?