16 Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.
17 Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.
18 Agaghi-ehota coral na crystal:E, nnweta amam-ihe kariri ruby.
19 Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.
20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
21 N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.
22 Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.