20 Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
21 N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.
22 Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.
23 Chineke aghọtawo uzọ-ya,Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.
24 N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;
25 Imere ifufe ihe-ọtùtù;Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.
26 Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe: