16 Nna ka m'buru ndi-ob͕eye:Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.
17 M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.
18 M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:
19 Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di,Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:
20 Nsọpurum di ọhu nimem,Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.
21 Mu ka madu gere nti, we chere,Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.
22 Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.