12 Gini mere ikperè abua di n'irum inaram?Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?
13 N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
14 Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;
15 Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:
16 Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?
17 N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.
18 N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.