1 Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim,Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.
2 Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram?Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.
3 N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.
4 Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.