11 N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12 N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13 Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.
14 Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.
15 Ihe-egwu echighariwo imegidem,Ha nāchu ọkakam dika ifufe;Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.
16 Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.
17 N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.