17 N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.
18 Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.
19 Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.
20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.
23 N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.