18 Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.
19 Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.
20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.
23 N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.
24 N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.