20 Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21 I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22 I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.
23 N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.
24 N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.
25 Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike?Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?
26 Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra;M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.