3 N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.
4 Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.
5 Anēsi n'etiti madu chupu ha;Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.
6 N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.
7 N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.
8 Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;Apiapuwo ha n'ala.
9 Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.