7 N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.
8 Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;Apiapuwo ha n'ala.
9 Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.
10 Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ,Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.
11 N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12 N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13 Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.