5 Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;
6 (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)
7 Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:
8 Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.
9 Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:
10 Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.
11 N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe: