13 Gini mere i ji so Ya se okwu,Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?
14 N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.
15 Na nrọ, bú ọhù nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;
16 Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
17 Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
18 Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
19 Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile: