16 Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
17 Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
18 Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
19 Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:
20 Nri we nāsọ ndu-ya oyi,Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.
21 Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.
22 Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.