22 Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.
23 Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya,Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri,Igosi madu izi-ezi-ya;
24 Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si,Dọputa ya n'irida n'olùlù,Achọtawom ihe-nb͕aputa.
25 Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwataỌ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:
26 Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:O we nyeghachi madu ezi omume-ya.
27 Ọ nābù abù n'iru madu, si,Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,Ma ọ baghm n'ihe:
28 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù,Ndum gēle kwa ìhè.