5 Ọ buru na i puru, zaghachim;Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.
6 Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ:Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.
7 Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku,Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.
8 N'ezie i kwuwo na ntim,Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,
9 Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
10 Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;
11 O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.