8 N'ezie i kwuwo na ntim,Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,
9 Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
10 Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;
11 O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.
12 Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi:N'ihi na Chineke di uku kari madu.
13 Gini mere i ji so Ya se okwu,Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?
14 N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.