22 Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.
23 N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.
24 O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.
25 N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.
26 Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya;
27 N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:
28 Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.