29 Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:
30 Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze,Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.
31 N'ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke,Eburuwom ahuhu, m'gaghi-eme ajọ omume ọzọ:
32 Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya:Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?
33 Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya?N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.
34 Madu ndi nwere obi gāsim,Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti:
35 Job, ọ bughi n'ọmuma-ihe ka o nēkwu,Okwu-ya nile adighi kwa n'inwe-uche.