11 Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa,Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
12 N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza,N'ihi npako di ọjọ.
13 N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu,Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.
14 Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya,Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.
15 Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi,Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku;