8 Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi;Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.
9 N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu;Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.
10 Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem,Onye nēnye abù ọma n'abali;
11 Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa,Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
12 N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza,N'ihi npako di ọjọ.
13 N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu,Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.
14 Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya,Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.