26 Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.
27 N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:
28 Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.
29 Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?
30 Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.
31 N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.
32 Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.