5 Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:Ọ di ike n'ike nke obi.
6 Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.
7 Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.
8 Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;
9 O we nēgosi ha ọlu-ha,Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.
10 O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.
11 Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma,Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.