5 Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?
6 N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,
7 Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?
8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
9 Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,
10 M'we kpawara ya ókèm,Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,
11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?