8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
9 Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,
10 M'we kpawara ya ókèm,Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,
11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?
12 Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;
13 Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?
14 Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe: