14 N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
15 O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
16 O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;
17 N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
18 Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.
19 Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?
20 Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.