19 Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?
20 Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.
21 Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya:Ọ nāpu izute ihe-agha.
22 Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.
23 Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya,Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.
24 Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.
25 Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe!Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha,Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.