5 Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?
6 Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya,Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.
7 Ọ nāchì ùzù obodo ọchì,Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.
8 Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya,Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.
9 Àtu gēkwe ibu orù-gi?Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?
10 Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi?Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?
11 Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?