1 Jehova we za Job, si,
2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nālusoOnye puru ime ihe nile ọ̀gù?Onye nābara Chineke nba, ya za ya.
3 Job we za Jehova, si,
4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi?Atukwasiwom, akam, n'ọnum.
5 Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa;E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.
6 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
7 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.