12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.
13 Zobekọ ha n'ájá;Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.
16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.