15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.
16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.
20 N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.
21 N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.