12 M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru,Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.
13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya?Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?
14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?Ezé-ya di oké ujọ buruburu.
15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
16 Dika otù si nọ ibe-ya nso,Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
17 Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.
18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.