26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27 Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29 Anāgu ndele n'ahihia-ọka:Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.
31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.
32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.