13 Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.
14 N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.
15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.
16 Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.
17 Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
18 N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.
19 Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.