12 Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?
13 Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14 I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15 Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
16 Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.
17 Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,
18 Na I nēleta kwa ya ututu nile,Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?