7 Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.
8 Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
9 Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.
10 Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.
11 Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
12 Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?
13 Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;