1 Bildad, bú onye Shua, we za, si,
2 Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia?Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?
3 Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ?Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile,Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?
4 Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya,Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:
5 Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike,We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;
6 Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu;N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.