6 Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu;N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.
7 Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà,Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.
8 N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu,Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:
9 (N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)
10 Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,Si n'obi-ha weputa okwu?
11 Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?
12 Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.