21 Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;Ajum ndum.
22 Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
23 Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.
24 Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25 Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26 Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.
27 Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum: