5 O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.
6 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.
7 Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.
8 Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
9 Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke?
10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.
11 Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.