1 Job we za, si,
2 N'ezie unu onwe-unu bu ndi bu ihe,Unu na amam-ihe gānwukọ n'otù.
3 Enwe-kwa-ram obi dika unu;Mu onwem abughi onye dara ada kari unu:Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
4 Onye bu ihe-ọchì nke madu-ibe-ya ka m'bu,Bú onye nākpọku Chineke, O we za ya:Ihe-ọchì ka onye ezi omume nke zuru okè bu.
5 Nleda diri ọdida n'èchìchè onye nọ jū;Edoziwo ya nye ndi ukwu-ha nāb͕uchapu ab͕uchapu.
6 Ulo-ikwū nile nke ndi nāpunara madu ihe di n'udo,Ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi nākpasu Chineke iwe;Bú onye ọ bula nke wetaworo chi-ya n'aka-ya.