7 Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe,Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi:
8 Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe;Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi.
9 Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile,Na aka Jehova emewo nka?
10 Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya,Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
11 Nti, ọ̀ dighi-anwa okwu?Okpo-ọnu kwa, ọ̀ dighi-edeturu onwe-ya ihe-oriri-ya?
12 Nime ndi kara nká ka amam-ihe di,N'ubọchi ndu di ogologo ka nghọta di kwa.
13 N'aka-Ya ka amam-ihe na idi-ike di;Ọ nwere ndum-ọdu na nghọta.