11 Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;
12 Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.
13 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ,Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,Ma asi na I kparam ókè, we chetam!
14 Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,Rue mb͕e nb͕anwem gābia.
15 I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.
16 N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:Ì dighi-elezi nmehiem anya?
17 Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà,I we tekpue ajọ omumem ihe.